2. Ndi Tesalọnaika 2:4-6 Bible Nso (IGBOB)

4. onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.

5. Ùnu echetaghi, na, mb͕e m'nānọ n'etiti unu n'oge gara aga, ọ bu ihe ndia ka m'nāgwa unu?

6. Ub͕u a unu matakwara ihe nēb͕ochi, ka ewe kpughe ya n'oge nke aka ya.

2. Ndi Tesalọnaika 2