2. Ndi Kọrint 9:11-15 Bible Nso (IGBOB)

11. ebe anēme ka unu buru ọgaranya n'ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n'aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke.

12. N'ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n'ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè;

13. ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;

14. ha onwe-ha kwa, n'aririọ-ha n'ihi unu, nāgusi unu ike n'ihi amara Chineke di nime unu nke kariri nke-uku.

15. Ekele diri Chineke n'ihi onyinye-Ya nke anāpughi ikọ akukọ ya.

2. Ndi Kọrint 9