1. N'ihi na ọ dighi nkpà ka m'degara unu akwukwọ bayere ijere ndi nsọ ozi:
2. n'ihi na amataram obi di ọku unu, nke m'nānyara ndi Masedọnia isi bayere unu, na Akaia akwadebewo n'arọ gara aga; inu-ọku-unu kwali-kwa-ra obi ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha.
3. Ma ezitewom umu-nna-ayi, ka ewe ghara ime inya-isi ayi nānya bayere unu ka ọ buru ihe-efu n'akuku a; ka unu we buru ndi nọ na nkwadebe, dika m'nēkwuri: