1. Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum:
2. Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
3. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile;