2. Ndi-Eze 25:12-17 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma ufọdu nime ndi ala ahu ndi nēnweghi ike ka onye-isi ndi-ob͕ū mere ka ha fọdu ibu ndi-ọlu-ubi-vine na ibu ndi-ọlụ-ubi.

13. Ma ogidi ọla nile nke di n'ulo Jehova, na ihe-ndọkwasi nile na oké osimiri ọla nke di n'ulo Jehova, ndia ka ndi Kaldea tipiara, chiri ọla-ha je Babilon.

14. Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.

15. Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.

16. Ogidi abua ahu, otù oké osimiri ahu, na ihe-ndọkwasi nile, nke Solomon mere nye ulo Jehova; ọ dighi ọtùtù atùru ọla ihe ndia nile.

17. Cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di, isi nke di n'elu ya bu kwa ọla: idi-elu isi ahu di cubit atọ; ihe-ọkpukpa na pomegranate di kwa n'isi ahu buruburu, ha nile bu ọla: ihe dika ndia ka ogidi nke-abua nwe-kwa-ra, ha na ihe-ọkpukpa.

2. Ndi-Eze 25