1. Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile ndi nwe ala-eze la n'iyì.
2. Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.