2. Ndi-Eze 10:18-21 Bible Nso (IGBOB)

18. Jihu we chikọta ndi Israel nile, si ha, Ehab fère Beal òfùfè nke-ntà; Jihu gēfè ya òfùfè rinne.

19. Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n'ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n'aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n'iyì.

20. Jihu we si, Donu ubọchi nb͕ochi nsọ nye Beal. Ha we kpọsa ya.

21. Jihu we ziga ozi n'Israel nile: ndi nile nēfè Beal we bia, ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nke nābiaghi. Ha we ba n'ulo Beal; ulo Beal we juputa na madu site n'otù ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ.

2. Ndi-Eze 10