2. Jọn 1:4-6 Bible Nso (IGBOB)

4. Anamaṅuri ọṅu nke-uku na ahuwom ufọdu n'etiti umu-gi ka ha nējeghari nime ezi-okwu, dika ayi natara ihe enyere n'iwu n'aka Nna-ayi.

5. Anamariọ kwa gi ub͕u a, nwanyi-nwe-madu, ọ bughi dika agāsi na anamedegara gi ihe ọhu enyere n'iwu n'akwukwọ, kama ọ bu nke ayi nwere site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya.

6. Ihu-n'anya ahu bu kwa nka, ka ayi nējeghari dika ihe nile O nyere n'iwu si di. Ihe ahu enyere n'iwu bu nka, dika unu nuru site na mbu, ka unu nējeghari nime ya.

2. Jọn 1