6. na Bealat, na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe nile di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.
7. Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'Israel;
8. site n'umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nēmeghi ka ha gwusia, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, rue ta.
9. Ma Solomon emeghi ndi-orù site n'umu Israel ije ozi-ya; kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-isi ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.