1. Mb͕e ahu Solomon siri, Jehova asiwo na O gēbi n'oké ọchichiri.
2. Ma mu onwem ewuworo Gi ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.
3. Eze we chigharia iru-ya, gọzie nkpọkọta nile nke Israel: nkpọkọta nile nke Israel nēguzo kwa.
4. Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya abua mezue ya, si,
5. Site n'ubọchi mb͕e M'mere ka ndim si n'ala Ijipt puta, arọputaghm obodo n'ebo nile nke Israel iwu ulo, ka aham we di n'ebe ahu; arọputaghkwam nwoke ọ bula ibu onye-ndú ndim, bú Israel:
6. ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.
7. O we di n'obi Devid, bú nnam, iwuru aha Jehova, bú Chineke Israel, ulo.
8. Jehova we si Devid, bú nnam, N'ihi na ọ di n'obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n'obi-gi:
9. otú ọ di gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu; kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.