2. Ihe Emere 4:12-15 Bible Nso (IGBOB)

12. ogidi abua ahu, na ọkwa abua ahu, na isi abua ahu nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi;

13. na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú ariri pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi.

14. O me-kwa-ra ihe-ndọkwasi iri ahu, me kwa ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;

15. na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru ya.

2. Ihe Emere 4