2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.
3. Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.
4. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka aham gādi rue mb͕e ebighi-ebi.
5. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.
6. Onye ahu me-kwa-ra ka umu-ya ndikom gabiga nime ọku nime ndagwurugwu nwa Hinom: o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, me ihe-mb͕asi, meso onye nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.
7. Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:
8. M'gaghi-esi kwa n'elu ala nke M'guzoro nye nna-unu-hà wezuga ukwu Israel ọzọ: nání ọ buru na ha elezi anya ime nile nke M'nyeworo ha n'iwu, bú iwu ahu nile na ukpuru nile na ikpé nile nke sitere n'aka Moses.