7. Ọzọ, ha emechiwo ọnu-uzọ nile nke uzọ-nbata, menyu oriọna nile, ha esureghi kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha esureghi kwa àjà-nsure-ọku, n'ebe nsọ ahu, nye Chineke Israel.
8. Iwe Jehova we dikwasi Juda na Jerusalem, O we rara ha nye ka ha buru ihe-nkwaghari, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, dika unu onwe-unu nēwere anya-unu hu.
9. Ma, le, nna-ayi-hà adawo site na mma-agha, umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ndinyom-ayi nọ na ndọta-n'agha n'ihi nka.