2. Ihe Emere 28:25-27 Bible Nso (IGBOB)

25. N'obodo nile ọ bula nke Juda ka o me-kwa-ra ebe di elu isurere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, o we kpasue Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà, iwe.

26. Ma ihe nile o mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

27. Ehaz we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo ahu, bú nime Jerusalem; ma ha ebubataghi ya n'ílì ndi-eze Israel: Hezekaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2. Ihe Emere 28