16. Na mb͕e ahu ka eze, bú Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka.
17. Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha.
18. Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu.
19. N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.