2. Ihe Emere 28:14-19 Bible Nso (IGBOB)

14. Ndi ejikere agha we rapu ndọta-n'agha ahu na ihe-nluta-n'agha ahu n'iru ndi-isi na nkpọkọta ahu nile.

15. Ndikom ahu ndi akpọrọ n'aha n'aha we bilie, jide ndọta-n'agha ahu, yikwasi ndi-ha b͕ara ọtọ uwe site n'ihe-nkwata ahu, ha we yikwasi ha uwe, yikwasi kwa ha akpukpọ-ukwu, me ha ka ha rie ihe, me kwa ha ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu, te ha manu, nēdu ha n'elu inyinya-ibu, bú onye ọ bula nāsu ngọngọ, ha we me ka ha biarue Jeriko, bú obodo ukwu, di umu-nne-ha nso: ha we laghachi na Sameria.

16. Na mb͕e ahu ka eze, bú Ehaz, zigara ndi-eze Asiria ozi ka ha yere ya aka.

17. Ndi Edom bia-kwa-ra ọzọ tib͕ue Juda, we dọta ndọta-n'agha n'agha.

18. Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu.

19. N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.

2. Ihe Emere 28