2. Ihe Emere 27:4-7 Bible Nso (IGBOB)

4. O wu-kwa-ra obodo ufọdu n'ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n'oké ọhia.

5. Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n'arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n'arọ nke-abua kwa, na n'arọ nke-atọ.

6. Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n'ihi na o doziri uzọ-ya nile n'iru Jehova, bú Chineke-ya.

7. Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.

2. Ihe Emere 27