Ma site na mb͕e Amazaia siri n'iso Jehova wezuga onwe-ya ha kekọtara nkekọta-madu imegide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.