1. Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n'ọnọdu ya: n'ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n'ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze.
2. Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri.
3. Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n'uzọ nile nke ulo Ehab: n'ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu.