1. Timọti 5:6-9 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma nwanyi nke nādi ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-ya utọ, ọ nwuruwo mb͕e ọ nọ na ndu.

7. Nēnye kwa ihe ndia n'iwu, ka ha we buru ndi anādighi-akalu.

8. Ma ọ buru na onye ọ bula ebughi uzọ chère ndi nke aka ya ihe nākpa ha, ma nke kachasi ndi èzí-na-ulo nke aka ya, ọ gọnariwo okwukwe-ayi, jọkari kwa onye nēkweghi ekwe na njọ.

9. Ka aghara ide aha nwanyi ọ bula n'akwukwọ dika nwanyi di-ya nwuru nke akāb͕aghi ọgu arọ atọ, onye buworo nwunye nke otù di,

1. Timọti 5