1. Timọti 5:19-22 Bible Nso (IGBOB)

19. Anarala ebubo anēbo okenye, ma-ọbughi n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.

20. Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.

21. Anamagwasi gi ike n'iru Chineke, na n'iru Kraist Jisus, na n'iru ndi-mọ-ozi arọputara, ka i debe iwu ndia, ghara ima ikpé mb͕e i kānughi, ghara kwa ime ihe ọ bula n'uzọ isọ-anya.

22. Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.

1. Timọti 5