1. Samuel 7:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.

5. Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m'gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu.

6. Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.

7. Ndi Filistia we nu na umu Israel chikọtara onwe-ha na Mizpa, ndi-isi ndi Filistia we rigo imegide Israel. Umu Israel we nu ya, tua egwu ndi Filistia.

8. Umu Israel we si Samuel, Ab͕ala nkiti bayere ayi n'itiku Jehova, bú Chineke-ayi, nkpu, ka O we zọputa ayi n'aka ndi Filistia.

9. Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.

10. O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n'ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n'iru Israel.

11. Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka.

1. Samuel 7