1. Samuel 30:10-18 Bible Nso (IGBOB)

10. Ma Devid nāchu, ya onwe-ya na nnù ndikom: ma ọgu ndikom iri guzoro n'azu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi igabiga miri-iyi Besoa:

11. ha we huta onye Ijipt n'ọhia, kuru ya jekuru Devid, nye ya achicha, o rie; ha we me ka ọ ṅua miri:

12. ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n'ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali.

13. Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m'bu, m'buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n'ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga.

14. Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.

15. Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.

16. O we me ka ọ rida, ma, le, ha ab͕asawo n'iru ala ahu nile, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ememe, n'ihi ihe-nkwata uku nile nke ha kwatara n'ala ndi Filistia, na n'ala Juda.

17. Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.

18. Devid we naputa ihe nile Amalek chiri: Devid naputa-kwa-ra ndinyom-ya abua.

1. Samuel 30