1. Samuel 30:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,

2. dọta kwa ndinyom na ndi nile nọ na ya n'agha, site n'onye ntà we rue onye uku: ha emeghi ka onye ọ bula nwua, kama ha dupuru ha, je ije-ha.

3. Devid na ndikom-ya we ba n'obodo, ma, le, esurewo ya n'ọku; adọtawo kwa ndinyom-ha na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'agha.

4. Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá.

1. Samuel 30