33. Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n'etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n'iru Jehova nime Gilgal.
34. Samuel we la na Rema; Sọl we rigorue ulo-ya, rue Gibea nke Sọl.
35. Samuel abiaghi kwa ọzọ ihu Sọl rue ubọchi ọnwu-ya; n'ihi na Samuel nēruru Sọl újú: ma Jehova cheghariri na o mere Sọl ka ọ buru eze Israel.