1. Samuel 13:20-23 Bible Nso (IGBOB)

20. Israel nile we ridakuru ndi Filistia iti ihe-ọlu-ha ufe, onye ọ bula ígwè-ikpọzè-ala-ya, na mma-ọgè-ya, na anyu-ike-ya, na ọ́gù-ya;

21. (ọnu ọ́gù na nke nma-ọgè na nke ndudu-ilu-ọlu-ubi na nke anyu-ike we ghara idi nkọ); na ikpu ọnu ndudu eji achu ehi.

22. O rue, n'ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n'aka onye ọ bula n'etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n'aka Sọl na n'aka Jonatan nwa-ya.

23. Ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia we pua rue ngabiga Mikmash.

1. Samuel 13