4. Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya.
5. Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.
6. Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.
7. Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n'otù n'otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.
8. Ma asim ndi nānọghi n'ọnọdu di na nwunye na ndi di-ha nwuru, Ọ diri ha nma ma asi na ha nānọgide dika mu onwem nọ kwa.
9. Ma ọ buru na ha apughi ijide onwe-ha, ka ha luru: n'ihi na ilu di na nwunye ka ire ọku n'agu aru nma.
10. Ma enyem ndi nọ n'ọnọdu di na nwunye iwu, ọ bughi mu onwem, kama ọ bu Onye-nwe-ayi, Ka nwunye ghara ikewapu onwe-ya n'aru di-ya
11. (ma asi na ọ bu ezie na ọ kewapuru onwe-ya, ya nọgide nēnweghi di; ma ọ meghi otú a, ka eme ka ya na di-ya di n'otù); ka di ghara kwa irapu nwunye-ya.
12. Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.
13. Ọzọ, nwanyi nke nwe di nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwoke ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka ọ ghara irapu di-ya.
14. N'ihi na edowo di nēkweghi ekwe nsọ nime nwunye-ya, edowo kwa nwunye nēkweghi ekwe nsọ nime nwa-nna-ayi nwoke: n'ihi na, ma ọ dighi otú a, umu-unu gābu umu nādighi ọcha; ma otú ọ di, ha di nsọ.
15. Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n'okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n'udo.
16. N'ihi na ì si aṅa mara, nwunye, ma i gāzọputa di-gi? ma-ọbu ì si aṅa mara, di, ma i gāzọputa nwunye-gi.
17. Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.
18. Àkpọrọ onye ọ bula mb͕e ebìsiri ya úgwù? ya ghara ighọ onye anēbìghi úgwù. Àkpọworo onye ọ bula n'ebìghi-úgwù? ya ghara ikwe ka ebì ya úgwù.
19. Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n'iwu.
20. Onye ọ bula, nime ọkpukpọ ahu eji kpọ ya, ya nọgide n'ọkpukpọ ahu.
21. Àkpọrọ gi mb͕e i bu orù? ya eb͕ula gi nb͕u n'obi: ma ọ buru kwa na i puru inwe onwe-gi, kari nke ahu were ya me ihe.