1. O rue, mb͕e Solomon wubìri ulo Jehova, na ulo eze, na ihe nile nke di Solomon ezi nma n'obi nke tọrọ ya utọ ime,
2. na Jehova mere ka Solomon hu Ya anya nke ub͕ò abua, dika O mere ka ọ hu Ya anya na Gibeon.
3. Jehova we si ya, Anuwom ekpere-gi na aririọ-amara-gi, nke i riọworo n'irum: edowom ulo a, nke i wuworo, nsọ, itiye aham n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi; anyam abua na obim gādi kwa n'ebe ahu ubọchi nile.
4. Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, n'izu-okè nke obi, na n'izi-ezi, ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;
5. M'gēme kwa ka oche-eze ala-eze-gi n'isi Israel guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi; dika M'gwara Devid, bú nna-gi, okwu si, Ọ dighi nwoke ọ bula i nwere agēbipu n'inọkwasi n'oche-eze Israel.