1. Ndi-Eze 6:35-38 Bible Nso (IGBOB)

35. Ọ pia n'elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n'elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha.

36. O were akuku nkume awara awa atọ na otù ariri osisi cedar awara awa wue ogige ime-ime.

37. N'arọ nke-anọ ka atọrọ ntọ-ala ulo Jehova, n'ọnwa Ziv.

38. Ma n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n'ihe-ya nile na n'ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n'iwu ya.

1. Ndi-Eze 6