1. Ndi-Eze 6:21-24 Bible Nso (IGBOB)

21. Solomon we were ọla-edo makarisiri nma machita ulo ahu nime: o me ka iyab͕a ọla-edo gabiga n'iru ime-ime-ulo ahu; ọ machita kwa ya ọla-edo.

22. Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu.

23. O me-kwa-ra cherubim abua nke osisi manu olive n'ime-ime-ulo ahu, cubit iri ka elu-ha di.

24. Cubit ise ka otù nku cherub di, cubit ise ka nkù nke-ọzọ nke cherub di kwa: site na nsọtu nkù-ya we rue nsọtu nke-ọzọ nke nkù-ya di cubit iri.

1. Ndi-Eze 6