7. Obadaia we nọ n'uzọ, ma, le, Elaija zutere ya: ọ mata ya, da kpue iru-ya n'ala, si, Ọ̀ bu gi bu nka, onye-nwem Elaija?
8. Ọ si ya, Mu ka ọ bu: je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.
9. Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua?
10. Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.
11. Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.