28. Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.
29. Ọ dọba otù nime Bet-el, tiye nke-ọzọ nime Dan.
30. Ihe a we ghọ nmehie: ndi Israel we je n'iru otù nime ha, rue Dan.
31. O me ulo nke ebe di elu, me kwa ndi-nchu-àjà sitere n'ọnu-ọgugu ndi Israel nile, ndi nēsiteghi n'umu Livai.
32. Jeroboam we me ememe n'ọnwa nke-asatọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, dika ememe nke di na Juda, o we rigorue ebe-ichu-àjà ahu; otú a ka o mere na Bet-el, ichuru umu-ehi ahu, bú nke o mere, àjà: o guzo na Bet-el ndi-nchu-àjà nke ebe di elu nke o mere.