15. nāgughi ihe ndikom ndi nējeghari izu ahia wetara, na ọzuzu-ahia nke ndi nāzu ahia, na ọla-edo nke eze nile nke ndi gwara ọgwa, na ọla-edo nke ndi nāchi ala.
16. Eze, bú Solomon, we me ọgu ọta uku iri, ha bu ọla-edo etisara etisa: nnù shekel ọla-edo na ọgu iri bara n'otù ọta uku.
17. O me-kwa-ra ọgu ọta iri-na-ise, ha bu ọla-edo etisara etisa; pound ọla-edo atọ bara n'otù ọta: eze we tiye ha n'ulo oké ọhia Lebanon.
18. Eze me-kwa-ra oké oche-eze ọdu, machita ya ọla-edo anuchara anucha.
19. Oche-eze ahu nwere ihe-nrigo isi, oche-eze ahu nwe-kwa-ra elu di buruburu n'azu ya: aka di kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ n'ebe ọnọdu-ya, ọdum abua nēguzo kwa n'akuku aka ahu.