10. Nime nka ka ihu-n'anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.
11. Ndi m'huru n'anya, ọ buru na Chineke huru ayi n'anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n'anya.
12. Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n'anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n'anya-Ya zue okè nime ayi:
13. nime nka ka ayi mara na ayi nānọgide nime Ya, na Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ayi, n'ihi na O nyewo ayi ufọdu nime Mọ nke Ya.
14. Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.
15. Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.