1. Jọn 3:8-11 Bible Nso (IGBOB)

8. onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì.

9. Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-eme nmehie, n'ihi na nkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pughi kwa imehie, n'ihi na amuwo ya site na Chineke.

10. Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya esighi kwa na Ya puta.

11. N'ihi na nka bu ozi ahu unu nuru site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya:

1. Jọn 3