23. Ndi ahu na umu-ha bu kwa ndi-isi ọnu-uzọ-ama nile diri ulo Jehova, bú ulo nke ulo-ikwū ahu, n'ihe-ndebe.
24. N'akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n'Ọwuwa-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida.
25. Ma umu-nne-ha, n'obodo ntà nile ha, nwe ibata kwa-ubọchi-asa site na mb͕e rue mb͕e, inọyere ha:
26. n'ihi na n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ka ha nọ, bú ndi-dike anọ nke ndi-ọnu-uzọ-ama, ha onwe-ha bu ndi Livai, ha bu kwa ndi-isi ime-ulo nile na ndi-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke.