1. Ihe Emere 4:41-43 Bible Nso (IGBOB)

41. Ndia ndi edeworo n'akwukwọ n'aha we bia n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n'ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n'ọnọdu ha: n'ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n'ebe ahu.

42. Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha.

43. Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.

1. Ihe Emere 4