19. nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.
20. Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze.
21. Ha we chuara Jehova àjà, sure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku, n'echi ubọchi ahu, bú nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù ebulu abua na ọgu iri, na nnù umu-aturu abua na ọgu iri, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, ọbuná àjà n'uba bayere Israel nile;
22. ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.
23. Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.