7. M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, ọ buru na ọ di ike ime ihe nile M'nyere n'iwu na ikpém nile, dika esi eme ta.
8. Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.
9. Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.
10. Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya.
11. Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie: