7. Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
8. Onye-isi nke-ise nke diri ọnwa nke-ise bu Shamhut onye-Izrahait: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
9. Onye-isi nke-isi nke diri ọnwa nke-isi bu Ira nwa Ikesh onye Tekoa: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
10. Onye-isi nke-asa nke diri ọnwa nke-asa bu Hilez onye-Pelonait, onye sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.