2. Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom; Zekaraia, bú ọkpara, na Jediael, bú nke-abua, na Zebadaia, bú nke-atọ, na Jatniel, bú nke-anọ;
3. na Ilam, bú nke-ise, na Jehohanam, bú nke-isi, na Eliehoenai, bú nke-asa.
4. Obed-edom nwe-kwa-ra umu-ndikom, Shemaia, bú ọkpara, na Jehozabad, bú nke-abua, na Joa, bú nke-atọ, na Saka, bú nke-anọ, na Netanel, bú nke-ise;
5. na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n'ihi na Chineke gọziri ya.