1. Ihe Emere 18:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

14. Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m'ikpe na ezi omume.

15. Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta.

16. Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ;

17. Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'aka eze.

1. Ihe Emere 18