23. Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.
24. Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
25. N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.