1. Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu.
2. Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin.
3. Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot;
4. na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira;
5. Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait;
6. Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora;
7. na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa.
8. Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;
9. Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;
10. Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise;
11. Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa;
12. Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete;
13. Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù.
14. Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri.
15. Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n'ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n'Ọwuwa-anyanwu ma n'Ọdida-anyanwu.
16. Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid.