1. Ihe Emere 11:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Israel nile we chikọta onwe-ha n'ebe Devid nọ rue Hebron, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu.

2. Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel.

3. Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n'aka Samuel si di.

1. Ihe Emere 11